SEC Nigeria weghaara ndu nke West Africa Securities Regulators Association (WASRA) E bipụtara: Juun 16, 2021

Maazị Lamido Yuguda, Onye Isi Nchịkwa nke Securities and Exchange Commission, Nigeria, weghaara ndu West African Securities Regulators Association (WASRA) dịka Onyeisi, na Mọnde, 14 Juun, 2021.

Maazị Yuguda ga-edu ọgbakọ ndị na-achịkwa ahịa akwụkwọ ego na West Africa ruo afọ abụọ, mgbe ọ nọchiri Reverend Daniel Ogbarmey Tetteh, Onye Isi Nchịkwa nke Securities and Exchange Commission Ghana.

Emume ịnyefe ọchịchị ahụ mere na nzukọ Kansụl Nchịkwa nke WASRA e mere n’ịntanetị, nke ndị isi ụlọ ọrụ niile nke ndị ọchịchị nchịkwa so n’ọgbakọ ahụ gara. N’okwu ọ gwara ha mgbe ọ nabatara ọkwa ahụ, Maazị Yuguda kelere Onyeisi na-apụ apụ maka ihe ndị ọgbakọ ahụ rụpụtara n’ime afọ abụọ na ọkara gara aga. O kwukwara na ọ kpebisiri ike imezu ụkpụrụ ndị bụ isi na ọhụụ WASRA.

Dịka Maazị Yuguda si kwuo, “Ijikọta ahịa isi ego n’ime mpaghara a ga-abụ isi ihe ọchịchị a ga-elekwasị anya na ya, ka anyị na-agba mbọ ime ka iwu WASRA rụọ ọrụ iji malite ọrụ ndị na-arụ na ahịa isi ego n’akụkụ dị iche iche nke mpaghara a n’ụzọ ziri ezi na nke pụtara ìhè.”

E guzobere WASRA na 2015 dịka ọgbakọ ụlọ ọrụ na-achịkwa ahịa isi ego nke gụnyere Nigeria, Ghana na Conseil Regional de L’Epargne Publique et des Marches Financiers (CREPMF), nke mejupụtara Mauritania, Senegal, Mali, Guinea Bissau, Cote d’Ivoire, Togo, Burkina Faso, Benin Republic na Niger, iji kwalite ijikọta ahịa n’ime mpaghara West Africa.

  1. Laghachi n'Ihu Mbụ
  2. /
  3. Maka Ndị Na-etinye Ego
  4. /
  5. Nọgide na-esochi akwụkwọ ntụziaka
  6. /
  7. SEC Nigeria weghaara ndu nke West Africa Securities Regulators Association (WASRA)
Kekọrịta: