Banyere: Ọrụ onye ọrụ ahịa megidere iwu, IBSmartify Nigeria E bipụtara: Juun 26, 2020
E dọtala uche Kọmishọn ahụ gaa n'ọrụ iBSmartify Nigeria, ndị na-akwalite teknụzụ ndekọ ejikọtara n’agbụ a maara dịka iBledger (iBcashcryptocurrency) na InksNation.
A na-agwa ọha na eze na e debanyeghị aha ndị na-akwalite iBSmartify Nigeria ma ọ bụ ngwaahịa ha nke iwu na-akwadoghị n'aka Kọmishọn ahụ, Kọmishọn ahụ anaghịkwa achịkwa ha.
N'ihi nke a, a na-adọ ọha na eze AKA NA NTỊ na onye ọ bụla ya na ụlọ ọrụ ahụ a kpọtụrụ aha ma ọ bụ ndị ọzọ na-arụ otu ụdị azụmahịa ahụ na-eme azụmahịa n'ụzọ ọ bụla na-eme ya n'ihe ize ndụ nke onwe ya.
A BINYERE AKA
NDỊ NCHỊKWA